2 Samuel 17:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n'ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel, onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab.