2 Samuel 18:22 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ahimaaz nwa Zedok we si kwa Joab ọzọ, Ma otú ọ di, biko, ka m'b͕a ọsọ, mu onwem kwa, n'azu onye Kush. Joab we si, N'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi ganāb͕a ọsọ, nwam, ma ọ dighi ozi ọma ahutara gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahimaaz nwa Zadọk rịọkwara Joab ọzọ sị ya, “Otu ọbụla o si dị, biko kwere ka m gbaso onye Kush a.” Ma Joab zara sị, “Nwa m nwoke, gịnị mere i ji chọọ ị ga? I nweghị ozi ọbụla ị ga-ezi nke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ.”