2 Samuel 18:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Eze we nye Joab na Abishai na Itai iwu, si, Menu nwayọ n'aru nwa-okorọbia, bú Absalom, n'ihim. Ndi-ya nile nu-kwa-ra mb͕e eze nyere ndi-isi nile iwu bayere Absalom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm.