2 Samuel 19:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nnù ndikom abua na ọgu iri so-kwa-ra ya site na Benjamin; Ziba kwa, onye nējere ulo Sọl ozi, ya na umu-ya ndikom iri na ise na orú ndi-orú-ya; ha we jisie ike gabiga Jọdan n'iru eze.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya na puku ndị ikom Benjamin sokwa. Ziba, onyeozi Sọl, na ụmụ ya ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ ndị ozi ya, mekwara ngwangwa ịbịarute Jọdan tupu eze erute nʼebe ahụ.