2 Samuel 19:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n'Israel ta? n'ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?”