2 Samuel 20:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n'ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m'si n'obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị otu a ka okwu ahụ dị. Otu nwoke a na-akpọ Sheba nwa Bikri, nke si nʼobodo ugwu Ifrem e weliela aka ya imegide eze, bụ Devid. Nyefee nwoke a ọsịịsọ nʼaka m, aga m esi nʼobodo a pụọ.” Nwanyị ahụ sịrị Joab, “A ga-atụpụtara gị isi ya site na mgbidi.”