2 Samuel 20:22 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n'amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n'obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n'ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem.