2 Samuel 21:17 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.”