2 Samuel 21:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Agha we di ọzọ na Gob ebusoro ndi Filistia; Elhanan nwa Jaare-oregim onye Bet-lehem we tib͕ue nwa-nne Gọlaiat onye Gat, onye osisi ube-ya di ka oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ na Gob, Elhanan nwa Jaịa onye Betlehem gburu nwanne Golaịat onye Gat, onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa.