2 Samuel 21:20 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Agha we di ọzọ na Gat, ma otú nwoke toro ogologo nọ n'ebe ahu, nkpisi aka-ya abua di isi isi, nkpisi ukwu-ya abua di kwa isi isi, ọnu-ọgugu-ha di orú na anọ; ma amu-kwa-ra onye ahu nye Rafa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa.