2 Samuel 23:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ; N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem, Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra: N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile, N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ. Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya, Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile. Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke. Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile.