2 Samuel 24:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Arọna we si Devid, Ka onye-nwem, bú eze were ihe di nma n'anya-ya sure ọku, le, ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka nile na ihe ehi nile ka ha buru nkú:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu, ka ha bụrụ nkụ.