2 Samuel 24:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo. Ewe riọta Jehova aririo bayere ala ahu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu n'ebe Israel nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Devid wuru ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ. Chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekpere o kpere nʼihi ala ahụ. Nrịa nrịa ahụ na-efe efe nke dakwasịrị Izrel kwụsịkwara.