2 Samuel 3:21 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Abnea we si Devid, Ka m'bilie je chikọtara onye-nwem, bú eze, Israel nile, ka gi na ha we b͕a ndu, ka i we buru kwa eze ndi nile nke nkpuru-obi-gi nāchọsi ike. Devid we zilaga Abnea, o we la n'udo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Abna sịrị Devid, “Ka m gaa ngwangwa ga kpọkọtaa ndị Izrel niile, nye onyenwe m bụ eze, ka gị na ha gbaa ndụ, ka ị bụrụ eze ndị niile mkpụrụobi gị na-achọsi ike.” Ya mere Devid zilara Abna. Ọ laa nʼudo.