2 Samuel 4:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Devid we nye umu-okorọbia-ya iwu, ha we b͕ue ha, bipu aka-ha na ukwu-ha, kwuba ha n'akuku ọdọ-miri nime Hebron. Ma ha were isi Ish-boshet, lìe ya n'ílì Abnea nime Hebron.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Devid nyere ụmụ okorobịa ya iwu ka ha gbuo mmadụ abụọ ahụ. Ha gbukwara ha. Emesịa, ha bipụrụ aka ha na ụkwụ ha. Were ozu ha kwụba ya nʼakụkụ ọdọ mmiri Hebrọn. Ha wekwaara isi Ishboshet, lie ya nʼili Abna na Hebrọn.