2 Samuel 4:7 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma mb͕e ha batara n'ulo, ka ya onwe-ya nēdina n'ihe-ndina-ya n'ime-ulo-ndina-ya, ha we tib͕ue ya, me ka ọ nwua, wezuga isi-ya, were isi-ya, je ije n'uzọ Araba abali ahu nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha abatala nʼụlọ mgbe Ishboshet dinara nʼelu ihe ndina ya, nʼime ụlọ ndina ya. Mgbe ha machara ya mma, gbuo ya, ha bipụrụ ya isi. Buru isi ya gbalaga. Jee ije abalị ahụ niile gafee ọzara.