2 Samuel 5:8 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Devid we si n'ubọchi ahu, Onye ọ bula nke netib͕u ndi Jebus, ya jerue ebe miri si aga, we tib͕ue ndi-ngwurọ na ndi-ìsì, bú ndi nkpuru-obi Devid nākpọ asì. N'ihi nka ka ha nāsi, Ndi-ìsì na ndi-ngwurọ nọ; ọ gaghi-abà n.ulo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị ahụ, Devid kwuru sị, “Onye ọbụla ga-emeri ndị Jebus ga-esite nʼọnụ warawara ebe mmiri si abanye nʼobodo a banyekwuru ndị ngwụrọ na ndị ìsì a bụ ndị iro Devid.” Ọ bụ nke a mere ha ji ekwu okwu sị, “Ndị ìsì na ndị ngwụrọ agaghị abata nʼụlọeze ahụ.”