2 Thessalonians 1:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ebe ihe ga-esi otu a dịrị, anyị na-arịọ Chineke arịrịọ nꞌihi unu, ka o mee unu ụdị ụmụ ya ọ chọrọ ka unu bụrụ. Ka o mee ka unu dị mma dị ka ọ chọrọ, ka o site nꞌokwukwe unu nye unu ike ya.
Igbo 2006
Ọ bu kwa nka ka ayi ji nēkpe kwa ekpere bayere unu mb͕e nile, ka Chineke-ayi we gua unu na ndi kwesiri ọkpukpọ akpọrọ unu, ka O were kwa ike mezu ihe nile ọ bula nke diri idi-nma ezi nma na ọlu nile ọ bula nke okwukwe;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, anyị na-anọgide nʼekpere nʼihi unu, na-arịọ ka Chineke gụọ unu dịka ndị kwesiri ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na-arịọkwa ka o site nʼike ya mee ka unu mezuo ebumnobi nke ihe dị mma, na ezi ọrụ niile nke okwukwe.