2 Thessalonians 1:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nꞌetiti nzukọ Kraịst nile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachi obi nọgidesie ike nꞌime nsogbu nile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu nꞌime Chineke, ọ bụladị nꞌetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.
Igbo 2006
ya mere ayi onwe-ayi nānya isi n'aru unu n'etiti nzukọ Chineke nile n'ihi ntachi-obi-unu na okwukwe-unu nime nsob͕u-unu nile na nime nkpab͕u nile unu nānagide;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nʼetiti nzukọ Chineke niile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachiobi nọgidesie ike nʼime nsogbu niile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu, ọ bụladị nʼetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.