2 Thessalonians 2:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌezie, ọ ga-eduhie ndị ahụ nile na-aga nꞌọkụ ala mmụọ, ndị ahụ jụrụ ikwenye eziokwu ahụ. Nꞌihi na ha jụrụ ịnabatara onwe ha eziokwu ahụ, jụ ikwere na ya, na ịhụ ya nꞌanya ka ọ zọpụta ha.
Igbo 2006
n'aghughọ nile kwa nke ajọ omume n'ebe ndi nāla n'iyì nọ; n'ihi na ha anaraghi ihu-n'anya nke ezi-okwu nke-ọma, ka ewe zọputa ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta.