2 Thessalonians 2:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ụmụnna anyị, ndị Chineke anyị hụrụ nꞌanya, ọ bụ ọrụ anyị ikele Chineke ekele mgbe nile nꞌihi na o buru ụzọ họpụta anyị maka ịzọpụta anyị na ịsacha anyị site nꞌọrụ Mmụọ Nsọ rụrụ, na site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌeziokwu ahụ.
Igbo 2006
Ma ayi onwe-ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi ndi Onye-nwe-ayi huru n'anya, n'ihi na Chineke rọputara unu site na mbu ka unu we nwe nzọputa nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ nēdo na ikwere ezi-okwu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị kwesiri inye Chineke ekele mgbe niile nʼihi unu ụmụnna ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya. Nʼihi na Chineke esitelarị na mmalite họpụta unu ka unu bụrụ ndị a zọpụtara site nʼọrụ ido nsọ nke Mmụọ Nsọ na site nʼokwukwe unu nʼeziokwu ahụ.