2 Thessalonians 2:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Unu ekwela ka e duhie unu, nꞌihi na ụbọchị ọbịbịa Kraịst agaghị eru tutuu ihe abụọ emezuo. Nke mbụ, a ghaghị iburu ụzọ nwee oge oke imegide Chineke ga-adị, mgbe ajọ omume ga-aba ụba dịrịkwa nꞌụdị dị iche iche. Nke abụọ, a ghaghị iburukwa ụzọ mee ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè
Igbo 2006
unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n'uzọ ọ bula: n'ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n'iyì,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi.