2 Thessalonians 2:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ekwensu ga-eji onye mmebi iwu ahụ na-abịa mere ngwa ọrụ. Ọ ga-ejupụta nꞌike ekwensu. Ọ ga-ejikwa aghụghọ rụọ ọrụ ebube pụrụ iduhie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-esitekwa nꞌaghụghọ dị iche iche mee ihe ịrịba ama dị iche iche.
Igbo 2006
bú onye ahu, nke ọbibia-ya di ka ilusi-ọlu-ike nke Setan n'ike nile ọ bula na ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche nke ugha,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha.