2 Thessalonians 3:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Na mmechi okwu anyị, ụmụnna anyị, kpeerenụ anyị ekpere. Rịọnụ arịrịọ ka Chineke mee ka ozi ọma Onyenwe anyị na-aga nꞌihu. Ka ike dị nꞌozi ọma ahụ weta nchegharị nꞌime ndị nile ga-anụ ya dị ka o wetara nꞌime ndụ unu, mgbe anyị bịakwutere unu na mbụ.
Igbo 2006
Nke fọduru, umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi, ka okwu Onye-nwe-ayi we b͕a ọsọ, ka ewe nye kwa ya otuto, otú ọ di kwa n'etiti unu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼikpeazụ, ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere ka ozi Onyenwe anyị gaa nʼihu na-agbasa ruo ebe niile ma bụrụ ihe a na-asọpụrụ, dị ka ọ gbasara nʼetiti unu.