2 Timothy 1:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a o meela ka ihe nile o zubere ime nꞌobi ya pụta ìhè site nꞌọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike nke ọnwụ nꞌiyi zi anyị ụzọ anyị gaesi nwee ndụ ebighị ebi site nꞌịtụkwasị ya obi.
Igbo 2006
ma emere ka ọ puta ìhè ub͕u a site na ngosi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist Jisus, Onye mere ka ọnwu ghara idi ìrè, site kwa n'ozi ọma Ya weputa ndu na emebighi-emebi n'ìhè,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ.