2 Timothy 1:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ana m ekele Chineke ekele nꞌihi gị Timoti. Ana m ekpere gị ekpere kwa ụbọchị. Ọtụtụ mgbe kwa, ma ọ bụ nꞌime abalị, ka m na-ebili na-arịọ Chineke arịrịọ ka ọ gọzie gị. Chineke, onye bụ Chineke nke nna nna m ha, na Chineke nke m kwa. Ọ bụkwa nanị otu ihe ka m na-ezube nꞌime ndụ a, ọ bụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ.
Igbo 2006
Anameleke Chineke, Onye m'nēkpere site na nnam ochie-hà n'akọ-na-uche di ọcha, otú nchetam bayere gi n'aririọm nile di n'ewepughi aka,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m ekele Chineke, bụ onye m na-ejere ozi ekele, dị ka nna nna m ha mere site nʼakọnuche dị ọcha, ọtụtụ mgbe ka m na-echeta gị nʼekpere m ehihie na abalị.