2 Timothy 1:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ Chineke zọpụtara anyị, kpọbata anyị nꞌọrụ ya dị nsọ. Ọ bụghị nꞌihi na anyị kwesịrị ka a kpọọ anyị, kama ọ bụ rịị nzube ya ịkpọ anyị tupuu a tọọ ntọ ala ụwa a, nꞌihi na ọ chọrọ isite nꞌihe ọ ga-emere anyị gosi anyị ịhụnanya ya na obi ọma ya, na amara ya site na Jisọs Kraịst.
Igbo 2006
Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a.