2 Timothy 2:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụkwa na anyị echee na ọrụ anyị na-arụrụ ya ugbu a siri ike, ka anyị cheta na otu ụbọchị anyị na ya ga-anọkọ. Anyị ga-esorokwa ya bụrụ ndị na-achị achị. Ma ọ bụrụ na anyị agọnarị Kraịst mgbe anyị nọ nꞌahụhụ, ya onwe ya ga-agọnarịkwa anyị nꞌalaeze ya.
Igbo 2006
asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na anyị anagide, anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị. Ọ bụrụ na anyị ajụ ya, ọ ga-ajụkwa anyị.