2 Timothy 2:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ọ bụrụ na anyị adaa mba, nọọ nꞌọnọdụ nke enweghị okwukwe ọ bụla, ya onwe ya na-anọgide bụrụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi, na onye ga-enyere anyị aka. Ọ gaghị agọnarị anyị, nꞌihi na anyị bụ akụkụ anụ ahụ ya, ọ ga-emezukwa nkwa ya nile o kwere anyị.
Igbo 2006
asi na ayi ekweghi ekwe, Ya onwe-ya nānọgide n'ikwesi ntukwasi-obi; n'ihi na Ọ pughi igọnari Onwe-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe, ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi, nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya.