2 Timothy 2:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Na-echetara ndị mmadụ eziokwu ndị a, na-agwasikwa ha ike nꞌaha Onyenwe anyị ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nꞌihi na okwu nzuzu ndị a na-eweta mgbagwoju anya. Ha bụkwa okwu na-abaghị uru nke naeweta nsogbu.
Igbo 2006
Nēchetara ha ihe ndia, nāgwasi ha ike n'iru Onye-nwe-ayi, ka ha ghara ise okwu bayere okwu efu, bú ihe nābaghi n'ihe, nēkpù ndi nānu anu iru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi.