2 Timothy 2:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌime ụlọ onye ọgaranya, ọtụtụ efere dị iche iche dị ya. Ụfọdụ nꞌime efere a ka e ji ọlaedo kpụọ, ụfọdụ ka e ji ọlaọcha kpụọ. Ndị ọzọ dịkwa e ji osisi ma ọ bụ aja kpụọ. Efere ndị ahụ dị oke ọnụ ahịa bụ nke e ji enye ndị ọbịa nri. Ma ndị ahụ dị ọnụ ala, bụ ndị e ji esi ihe, ma ọ bụ ndị e ji ekpofu unyi.
Igbo 2006
Ma nime ulo uku ọ bughi nání ihe ọla-edo na ihe ọla-ọcha di, kama ihe osisi na ihe ájá di kwa; e mekwara ufọdu ka ha buru ihe-nsọpuru, me kwa ufọdu ha na buru ihe-ihere.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼime ụlọ ukwuu, ọtụtụ ngwa ọrụ dị ya, ndị e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, maọbụ osisi maọbụ ụrọ kpụọ. Ụfọdụ ka e ji eje ozi nʼoge nkwanye ugwu dị mkpa, ndị ọzọ ka e ji eje ozi nʼoge ọbụla.