2 Timothy 2:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na onye ọ bụla edozie onwe ya ọcha hapụ ime mmehie, ọ ga-adị ka efere ndị e ji ọlaedo kpụọ, nke a na-enye nsọpụrụ nꞌụlọ ahụ. Ọ ga-abụkwa onye e doro iche, onye Kraịst doziri iji rụọ ọrụ ọma nile.
Igbo 2006
Ya mere ọ buru na onye ọ bula asacha onwe-ya pua n'ihe ndia, ọ gābu ihe emere ka ọ buru ihe-nsọpuru, ihe edoworo nsọ, ihe bara n'ihe ka Onye-nwe-ya were ya me ihe, ihe edoziworo iji lu ezi ọlu nile ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na onye ọbụla edoo onwe ya ọcha pụọ nʼihe ọjọọ niile, ọ ga-abụ ngwa ọrụ e mere maka ọrụ ndị kwesiri nkwanye ugwu, bụrụkwa onye dị nsọ, onye na-abara Onyenwe ya uru, na onye dị njikere mgbe ọbụla ịrụ ezi ọrụ.