2 Timothy 2:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Gbanarị ihe ọ bụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorọbịa naenwe nꞌime gị. Kama nọọ nso ihe ọ bụla ga-eme gị ịchọ ime ezi ihe. Bụrụ onye nwere okwukwe na ịhụnanya na onye mmekọrịta nke ya ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya na ndị nwere obi ọcha na-atọ ụtọ.
Igbo 2006
Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.