2 Timothy 2:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jiri obi dị nwayọọ mgbe ị na-ezi ndị naadịghị agbaso ụzọ eziokwu ahụ ihe. Nꞌihi na ọ bụrụ na i jiri obi dị nwayọọ na nsọpụrụ gwa ha okwu, ha nwere ike site nꞌinyeaka Chineke chegharịa, site nꞌihe na-abụghị eziokwu kwere nꞌihe bụ eziokwu.
Igbo 2006
n'idi-nwayọ nādọ ndi nēdo onwe-ha imegide ya aka na nti; ma asi na ọ bu ezie ma eleghi anya na Chineke gēnye ha nchèghari ka ha we mazu ezi-okwu,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu.