2 Timothy 3:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha nꞌanya, na ndị na-ahụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwulu Chineke, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, ma ọ bụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nꞌobi ha.
Igbo 2006
N'ihi na madu gābu ndi nāhu nání onwe-ha n'anya, ndi nāhu ego n'anya, ndi nānya isi, ndi-npako, ndi-nkwulu, ndi nēkweyeghi ndi muru ha, ndi nēnweghi ekele, ndi nādighi ọcha n'obi,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha.