2 Timothy 3:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị na-abanye nꞌime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nꞌihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụ obi ha agụụ. Ọ bụ ụdị ụmụ nwanyị a ka ha na-ezi ozizi ọhụrụ ha.
Igbo 2006
N'ihi na ha sitere na ndia, bú ndi nēb͕ebà nime ulo di iche iche, nādọta kwa ndinyom nēnweghi uche n'agha, bú ndi ekpokwasiworo ha nmehie, ndi agu ihe ọjọ di iche iche dufuworo,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ nʼime ha bụ ndị na-abanye nʼime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nʼihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụobi ha agụụ.