2 Timothy 4:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌeluigwe, okpueze nke ezi omume dị na-eche m, nke Onyenwe anyị, onye naekpe ikpe ziri ezi ga-enye m nꞌụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi. Kama ọ bụghị nanị mụ onwe m ka ọ ga-enye okpueze ahụ, ọ ga-enyekwa ya ndị nile ga-eji ịhụnanya na-eche ọbịbịa ya.
Igbo 2006
nke fọduru bu na edebeworom okpu-eze nke ezi omume ahu, nke Onye-nwe-ayi, bú Onye ezi omume n'ikpe ikpé, gēnyeghachim n'ubọchi ahu: ma ọ bughi nání mu onwem, kama Ọ gēnyeghachi kwa ndi nile huworo ngosi-Ya n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya.