3 John 1:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe m bịara aga m agwa gị ihe nile ọ na-eme na ọtụtụ ihe nile ọ na-ekwu megide m, na ụdị okwu ọjọọ nile ọ na-ekwu imebi aha m. Ọ bụghị nanị na ọ jụrụ ịnabata ndị ozi a, kama ọ na-egbochi ndị ọzọ chọrọ inyere ha aka ime otu ahụ. Ihe ọ na-eme bụ isite nꞌụlọ chọọchị chụpụ ndị nile na-anabata ha.
Igbo 2006
N'ihi nka, ọ buru na abiam, m'gēme ka echeta ọlu-ya nile nke ọ nālu, n'iwere ajọ okwu nēkwugide ayi ihe-nzuzu: afọ ejughi kwa ya n'ihe ahu, ma ya onwe-ya adighi-anara umu-nna-ayi nke-ọma, ọ nēb͕ochi kwa ndi nēzube inara ha, ọ nāchupu kwa ha na nzukọ Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ bụrụ na m abịa, aga m eme ka ihe niile ọ na-eme na ọtụtụ ihe niile ọ na-ekwu megide anyị pụta ìhè. Ọ bụghị naanị na afọ ejughi ya nʼihi ihe ndị a niile, ọ jụrụ ịnabata ndị ụmụnna, ma na-egbochi ndị ọzọ chọrọ ịnabata ha ka ha ghara ime otu ahụ. Ọ na-achụpụkwa ha site nʼụlọ nzukọ.