3 John 1:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ezi enyi m m hụrụ nꞌanya, ekwela ka ụdị omume ọjọọ dị otu a bata nꞌime gị. Bụrụ onye na-agbaso ihe ziri ezi na eziokwu mgbe nile. Cheta na ndị nile na-eme ezi ihe na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ma ndị ahụ na-anọgide na-adị ndụ nꞌime mmehie na-ezipụta na ha bụ ndị dị anya site nꞌebe Chineke nọ.
Igbo 2006
Onye m'huru n'anya, eṅomila ihe ọjọ, kama nēṅomi ezi ihe. Onye nēme ezi ihe bu onye siri na Chineke puta: onye nēme ihe ọjọ ahughi Chineke mb͕e ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye m hụrụ nʼanya, eṅomila ihe dị njọ kama ṅomie ihe dị mma. Onye ọbụla na-eme ezi ihe na-egosi na o si na Chineke. Onye ọ bụlakwa na-eme ajọ ihe ahụbeghị Chineke anya.