3 John 1:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma onye ọ bụla na-ekwu ezi ihe banyere Dimitriọs. Jisọs Kraịst, onye bụ eziokwu ahụ, na-ekwu ihe ọma banyere ya. Ma mụ onwe m na-ekwu otu ihe ahụ banyere ya. Ị makwaara na ọ bụ ezi ama ka m na-agba.
Igbo 2006
Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla na-agba ezi ama banyere Dimitriọs ọ bụladị eziokwu ahụ nʼonwe ya. Anyị na-ekwukwa ezi ihe banyere ya. Ị makwaara na ọ bụ ezi ama ka anyị na-agba.