Acts 1:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha nọ nꞌugwu olivu mgbe ihe ndị a na-eme. Emesịa, ha sitere nꞌebe ahụ laghachikwa na Jerusalem. Ugwu olivu adịghị anya site na Jerusalem. Ọ bụ ihe dị ka kilomita abụọ site nꞌebe ahụ.
Igbo 2006
Mb͕e ahu ha siri n'ugwu anākpọ Olivet, nke di Jerusalem nso, ije nke otù ubọchi-izu-ike, laghachi na Jerusalem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem.