Acts 1:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha lọghachiri Jerusalem, ha rigooro nꞌelu ụlọ ahụ ha nọ nꞌime ya. Ndị a bụ ndị nọ nꞌụlọ ahụ: Pita, na Jọn, na Jemes, na Anduru, na Filip, na Tọmọs, na Batalomi, na Matiu, na Jemes nwa Alfiọs, na Saịmọn onye aha ya bụkwa Zilọt, na Judas nwa Jemes.
Igbo 2006
Mb͕e ha batara n'obodo, ha we rigo n'ime-ulo di n'elu ulo, ebe ha nānọ; Pita na Jọn na Jemes na Andru, Filip na Tomas, Batọlọmiu na Matiu, Jemes nwa Alfiọs, na Saimon Zilotis, na Judas nwa Jemes.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha batara nʼobodo, ha rigoro nʼime ụlọ ahụ dị nʼụlọ elu, ebe ha na-anọ. Ndị a bụ ndị nọ nʼụlọ ahụ: Pita, Jọn, Jemis na Andru, Filip na Tọmọs, Batalomi na Matiu, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas nwa Jemis.