Acts 1:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
E dere ya nꞌakwụkwọ Abụ Ọma sị, ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nꞌefu. Ka mmadụ ọ bụla hapụ ibi nꞌime ya. Ka onye ọzọ narakwa ọrụ ya.’
Igbo 2006
N'ihi na edewo ya n'akwukwọ Abù ọma, si, Ka ebe-ulo-ikwū-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, Ka onye ọ bula ghara kwa ibi na ya: na, Ka onye di iche nara ya ọlu-nlekọta-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’ na, “ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’