Acts 1:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha kpere ekpere rịọ Chineke ka o gosi ha onye ha ga-ahọrọ nꞌime mmadụ abụọ ahụ. Otu a ka ha si kpee ekpere ahụ: “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ nile. Gosi anyị onye ị họpụtara nꞌime mmadụ abụọ ndị a ka ọ bụrụ onyeozi ga-anọchi anya Judas Iskariọt, onye gara ebe o kwesịrị ka ọ gaa.”
Igbo 2006
Ha we kpe ekpere, si, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, Onye mara obi madu nile, gosi ayi onye ahu I rọputara nime madu abua ndia,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a.