Acts 1:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O gosiri ha onwe ya mgbe o si nꞌọnwụ bilie. Ihe ruru iri ụbọchị anọ site na mgbe a kpọgburu ya, ha hụrụ ya na ndụ site nꞌoge ruo nꞌoge. Nꞌụzọ doro anya, o gosiri ha na ọ bụ ya onwe ya ka ha na-ahụ. Nꞌoge a ọ gwara ha okwu banyere alaeze Chineke.
Igbo 2006
ndi O ji kwa ọtutu uzọ nādighi igọ agọ che Onwe-ya n'iru ha na ndu mb͕e Ọ husiri ahuhu, ebe O mere ka ha nāhu Ya anya n'ogologo ọgu ubọchi abua, O nēkwu kwa ihe nile bayere ala-eze Chineke:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke.