Acts 10:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma o juru Pita anya nke ukwuu ihe ọhụ ahụ pụtara. Ọ malitekwara iche echiche ihe ọ ga-eme banyere ya. Ma mgbe ọ na-atule ihe ndị a nꞌobi ya, lee, ndị ozi ahụ Kọniliọs zipụrụ abịarutela. Ha guzokwa nꞌọnụ ụzọ ụlọ ahụ ebe Pita nọ.
Igbo 2006
Ma mb͕e Pita nēnwe obi abua nime onwe-ya ihe ọ gābu, bú ọhù ọ hururi, le, ndikom ahu ndi Kọniliọs zitereri, ebe ha jusiri ajuju ulo Saimon, ha guzoro n'ọnu-uzọ-ama,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Pita nọ na-atule ihe ọhụ ahụ pụtara bụ nke gbakwara ya gharịị, lee, ndị ikom ahụ Kọnelịọs zipụrụ abịarutela kwụsị nʼọnụ ụzọ, na-ajụ ebe ụlọ Saimọn dị.