Acts 10:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha zara sị ya, “Ọ bụ Kọniliọs onyeisi agha anyị zitere anyị. Nwoke a bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke. Ọ bụkwa onye ndị Juu nile na-asọpụrụ. Otu ụbọchị, mmụọ ozi bịakwutere ya, gwa ya ka o zie ozi kpọọ Pita ka ọ bịakwute ya. Na Pita bụ onye ga-eme ka Kọniliọs mata ihe nile Chineke chọrọ ka o mee.”
Igbo 2006
Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha sịrị, “Ọ bụ Kọnelịọs onyeisi agha na-elekọta narị ndị agha zitere anyị. Ọ bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ndị Juu niile na-asọpụrụ. Mmụọ ozi dị nsọ gwara ya ka ọ kpọta gị nʼụlọ ya, ịnụ ihe i nwere ikwu.”