Acts 10:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Saimọn Pita kpọbatara ha nꞌụlọ. Nꞌebe ahụ ka ha dinara nꞌabalị ahụ. Nꞌechi ya, Pita sooro ha gaa. Ọtụtụ ndị kwere ekwe sokwaara ya gaa, site nꞌobodo ahụ a na-akpọ Jopa.
Igbo 2006
Ya mere ọ kpọbatara ha, le ha ọbìa. Ma n'echi-ya o bilie so ha pua, ufọdu nime umu-nna nime Kraist, bú ndi Jọpa, so-kwa-ra ya je.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa. Echi ya, o biliri soro ha gawa, ụfọdụ ndị kwere ekwe na Jopa sokwara ya gaa.