Acts 10:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Saimọn Pita gwara ndị nọ nꞌụlọ ahụ okwu sị, “Unu maara nke ọma na o megidere omenala ndị Juu na m ga-abata nꞌụlọ Kọniliọs. Ma Chineke gosiri m site nꞌọhụ, na o kwesịghị ka m leda mmadụ ibe m ọ bụla anya, ma ọ bụ gụọ onwe m dị ka onye karịrị ndị ọzọ mma.
Igbo 2006
o we si ha, Unu onwe-unu mara otú ọ bu ihe nēzighi ezi n'iwu ka nwoke nke bu onye-Ju were onwe-ya rapara n'aru onye mba ọzọ ma-ọbu ijekuru ya; otú ọ di, mu onwem ka Chineke gosiri ka m'ghara ikpọ madu ọ bula ihe ruru árú ma-ọbu ihe nādighi ọcha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Unu maara nke ọma na ọ bụ ihe megidere iwu na onye Juu na onye mba ọzọ ga-enwe mmekọrịta maọbụ gaa leta onye mba ọzọ. Ma Chineke ezila m na m ekwesighị ịkpọ mmadụ ọbụla onye rụrụ arụ maọbụ onye na-adịghị ọcha.