Acts 10:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kọniliọs sịrị ya, “Nꞌụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nꞌoge ehihie, nꞌihe dị ka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m otu nwoke ka o guzoro nꞌihu m. O yikwasịrị onwe ya uwe dị ọcha, nke na-egbukwa amụma.
Igbo 2006
Kọniliọs we si, Ubọchi anọ gara aga, rue oge hour nka, m'nēkpe ekpere n'oge hour nke-iteghete n'ulom; ma le, otù nwoke guzoro n'irum n'uwe nēnwu enwu,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kọnelịọs sịrị, “Nʼụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nʼoge ehihie nʼụlọ m, nʼihe dịka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m nwoke yi uwe na-enwu ọcha ka o guzoro nʼihu m.